Numbers 4:26 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n'onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n'akuku ebe-obibi ahu na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.