Numbers 5:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.