Numbers 5:30 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgaru nwoke n'aru, ọ we kwo nwunye-ya ekworo; o gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, onye-nchu-àjà gēme kwa ya iwu a nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.