Numbers 6:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-Nazirait ahu gākọpu kwa isi nke nkewaputa-ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ọ gēwere kwa agiri-isi nke isi nke nkewaputa-ya, tiye ya n'elu ọku nke di n'okpuru ihe àjà nke àjà-udo ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.