Numbers 6:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n'isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.