Numbers 8:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.”