Numbers 9:20 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha.