Numbers 9:23 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'okwu-ọnu Jehova ha nāma ulo-ikwū-ha, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije: ihe-ndebe nke Jehova ka ha debere, n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼiwu Onyenwe anyị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu Onyenwe anyị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile Onyenwe anyị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.