Obadiah 1:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ulo Jekob gābu kwa ọku, ulo Josef gāghọ kwa ire-ọku, ma ulo Isọ gāghọ ahihia-ọka, ha gēre kwa ọku n'etiti ha, ripia ha: ọ dighi kwa onye fọduru afọdu ulo Isọ gēnwe; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.