Obadiah 1:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'ridarue ala?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’