Philemon 1:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Aga m akwụghachi gị ya! Ka m jiri aka m dee ya nꞌebe a: mụ onwe m bụ Pọl ga-akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nꞌihi na ụgwọ i ji m bụ mkpụrụ obi gị nꞌonwe ya.
Igbo 2006
Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n'akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m'ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n'ugwọ tukwasi ihe ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.