Philippians 1:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na Chineke agaghị ekwe ka m mee ihe ọ bụla ga-eme ka ihere mee m nꞌụzọ ọ bụla. Enwekwara m olileanya na m ga-aga nꞌihu nọdụ na njikere ikwupụta okwu na-atụghị egwu nꞌihi Kraịst, ọ bụladị ugbu a m nọ nꞌahụhụ ndị a. Aga m ekwupụta okwu ahụ dị ka m si ekwu ya nꞌoge gara aga. Aga m agakwa nꞌihu ịhụ na ndụ m bụ ihe ga-ewetara Kraịst otuto nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ na ndụ ma ọ bụ nꞌọnwụ.
Igbo 2006
dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.