Philippians 1:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe ụfọdụ ụzọ ihe abụọ na-agụsi m ike. Ọ na-agụ m ịdị ndụ na-aga nꞌihu, ma mgbe ụfọdụ ọ na-agụ m ikewapụ onwe m site nꞌanụ ahụ nke a, ka m lakwuru Kraịst, ebe mụ na ya ga-anọ mgbe nile. Ọ bụkwa ịlakwuru Kraịst kachasị ihe nile ọ bụla mma.
Igbo 2006
Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma.