Philippians 1:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma nꞌọnọdụ ọ bụla m nọ, na-ebinụ ndụ ga-egosi na unu bụ ndị Kraịst nꞌezie. Ka ọ bụrụ na a sị na m mesịrị nwee ike ịbịa ịnọnyere unu, ma ọ bụ, a sị na m enweghị ike ịbịa ịnọnyere unu, akụkọ m ga na-anụ banyere unu ga-abụ nke ga-akọ otu unu si jiri otu obi guzosie ike, jikọtaa onwe unu nꞌotu, ikwusa ozi ọma Kraịst,
Igbo 2006
Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,