Philippians 1:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ihe ziri ezi nꞌebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu nile nꞌihi na unu dị m nꞌobi. Mụ na unu esorola keta oke na ngọzi ahụ Chineke na-enye ọ bụladị mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na mgbe m si nꞌụlọ mkpọrọ pụta na-arụ ọrụ igbasa ozi ọma.
Igbo 2006
dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.