Philippians 2:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọ bụla dịrị anyị nꞌihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere ihe dị ka inyeaka nke si nꞌịhụnanya na-abịa, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọ bụla anyị na-enwekọ nꞌime Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na unu nwere obi ebere, jikerekwa ime ebere,
Igbo 2006
Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n'anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko,