Philippians 2:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌezie, ọ bụrụ na a wụsịa ọbara m dị ka ihe ịchụ aja nye Chineke nꞌihi okwukwe unu, ee, a sị na e gbuo m nꞌihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ meekwa ka unu soro m ṅụrịa ọṅụ.
Igbo 2006
E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ