Philippians 2:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs. Unu zitere ya ka ọ bịa nyere m aka nꞌọnọdụ mkpa m. Mụ na ya bụ nnọọ ezi nwanne, ndị na-arụkọ ọrụ nꞌotu, dị ka ndị agha Jisọs Kraịst.
Igbo 2006
Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m.