Philippians 2:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nꞌọrịa ahụ daa nꞌụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị ya nanị ka Chineke meere ebere, kama o mekwaara m ebere, nꞌihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m mwute gaara abụ nke m, ma a sị na Epafroditọs nwụrụ.
Igbo 2006
n'ihi na aru-ya adighi ike n'ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta n'elu ihe-nwuta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute.