Philippians 2:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Echela echiche nanị banyere ọdịmma nke gị, ebila ndụ nꞌụzọ ịdọtara onwe gị otuto ndị ọzọ. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye echiche ya bụ ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ya mma.
Igbo 2006
unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.