Philippians 2:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọ fọdụrụ nwa ntịị ka ọ nwụọ, nꞌihi ọrụ ọ na-arụrụ Kraịst. O kwenyere itufu ndụ ya na mgbalị nile ọ gbalịrị, inyere m ụdị aka ahụ unu gaara enyere m, ma ọ bụrụ na unu nọ nso.
Igbo 2006
n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.