Philippians 3:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ewezugala m ihe ndị ahụ nile, nꞌihi na achọpụtara m na nke a bụ nanị ụzọ mmadụ si amara Kraịst na ike ahụ e ji kpọlite ya site nꞌọnwụ. Ọ bụkwa nanị site nꞌụzọ a ka e si achọpụta ihe iso Kraịst hụọ ahụhụ, na iso ya nwụkọọ ọnwụ pụtara.
Igbo 2006
ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.