Philippians 3:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anaghị m ekwu nꞌebe a na etozuola m, mara ihe nile. Amụtachabeghị m ihe nile m kwesịrị ịmụta. Kama ihe m na-eme bụ ịgbalịsị ike ịrụ ọrụ m na-aga nꞌihu, tutuu ruo ụbọchị ahụ m ga-abụ ihe ahụ nile Kraịst onye zọpụtara m, chọrọ ka m bụrụ.
Igbo 2006
Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.