Philippians 3:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Enwere m olileanya na unu nile, bụ ndị tozuru oke nꞌiso Jisọs Kraịst, ga-aghọta ihe ndị a m na-ekwu. Ọ bụrụkwa na unu nwere nghọta ọzọ dị iche banyere ihe m kwuru, amaara m na Chineke ga-eme ka ọ pụtara unu ìhè,
Igbo 2006
Ya mere, ka ayi ra, bú ndi tozuru okè, ka ayi tukwasi uche na nka: ọ buru kwa na unu tukwasi uche n'ihe ọ bula n'uzọ di iche, ọbuná nka ka Chineke gēkpughere unu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.