Philippians 3:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-eji anụ ahụ dị ebube, nke yiri nke ya, gbanwee anụ ahụ anyị ndị a nke na-anwụ ọnwụ. Ọ bụkwa ike ya ahụ dị ukwuu, nke ọ ga-eji lụgbuo ihe nile dị nꞌụwa, ka ọ ga-eji nye anyị ahụ ọhụrụ ahụ.
Igbo 2006
Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.