Philippians 3:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A sị na e nwere otu onye pụrụ ịnya isi na o nwere ike ịzọpụta onwe ya, onye ahụ gaara abụ mụ onwe m. A sị na ndị ọzọ na-eche na a ga-azọpụta ha nꞌihi ihe ha bụ, a gaara azọpụtakwa m nꞌihi ihe m bụ.
Igbo 2006
ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n'anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n'anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n'anu-aru kari:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: