Philippians 3:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ee, akpọọla m ihe ndị a nile ihe efu, nꞌihi na a pụghị iji ha tụnyere ihe dị oke ọnụ ahia dị ka ịmazu Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Etufuola m ihe ndị a nile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike nwezuo Kraịst.
Igbo 2006
E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.