Philippians 3:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka m nwee ike bụrụ onye e jikọtara ya na Kraịst, onye na-adịghị agụkwa onwe ya dị ka onye pụrụ ịzọpụta onwe ya site nꞌezi omume ya, ma ọ bụ site nꞌidebezu iwu Chineke. Kama ka m bụrụ onye a na-azọpụta nanị site nꞌịtụkwasị Kraịst obi. Nꞌihi na ụzọ ahụ Chineke chọrọ isi mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo dabeere nꞌokwukwe, ọ dabeere nꞌokwukwe anyị nꞌime Kraịst nanị.
Igbo 2006
ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n'iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n'elu okwukwe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.