Philippians 4:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Obi dị m nnọọ ụtọ nꞌihi inyeaka unu nyeere m ọzọ. Ana m etokwa Onyenwe anyị nꞌihi ya. Amaara m na ọ dị unu nꞌobi kemgbe izitere m ihe unu nwere ike, ma unu enwebeghị ohere ime ya.
Igbo 2006
Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n'oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n'ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n'ezie, ma unu enweghi oghere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.