Philippians 4:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Dị ka unu maara, na mmalite, site na mgbe m kwusaara unu ozi ọma tutuu ruo mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, gaa Masidonia, ọ bụ nanị unu ndị Filipai, bụ ndị na-enyere m aka site nꞌinye m onyinye. O nwebeghị chọọchị ọzọ mere ihe dị otu a.
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu.