Philippians 4:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, sị gị biko, nyere ụmụ nwanyị a aka idozi okwu ha, nꞌihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, sorokwa ndị ọzọ mụ na ha rụkọrọ ọrụ rụọ ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ.
Igbo 2006
E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.