Proverbs 30:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.