Psalms 27:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.