Psalms 40:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile, Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ: Apughi idoro Gi ha n'usoro; Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha, Ha kariri igu-ọnu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.