Psalms 68:30 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Basiere anu-ọhia nke amì nba ike, Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche, Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha; Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba, igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile. Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha. Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.