Psalms 96:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “ Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.