Revelation 1:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ngọzi na-adịrị onye ọ bụla ga-agụpụta ihe e dere nꞌakwụkwọ amụma a nꞌụlọ nzukọ. Ọ ga-anata ngọzi pụrụ iche site nꞌaka Onyenwe anyị. Ndị nile ga-egekwa ntị mgbe a ga-agụpụta ha, ma meekwa ihe e kwuru, ga-enwetakwa ngọzi. Nꞌihi na oge a ga-emezu ihe ndị a dị oke nso.
Igbo 2006
Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.