Revelation 1:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.
Igbo 2006
nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.