Revelation 1:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ mụ onwe m nwanne unu nwoke Jọn, onye unu na ya na-ahụrịta ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị, na-edere unu akwụkwọ a. Mụ onwe m esorola keta oke nꞌime ntachi obi Onyenwe anyị Jisọs na-enye. Anyị nile ga-esorokwa keta alaeze ya. Ma ọ bụ nꞌihi okwu Chineke ka e ji site nꞌebe ndị mmadụ bi zipụ m ka m gaa biri nꞌala Patmọs, ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu. E zigara m nꞌebe ahụ nꞌihi na m kwusara okwu Chineke ma kọwaakwa eziokwu ahụ Jisọs kpughere nye anyị.
Igbo 2006
Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.