Revelation 10:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nꞌeluigwe rịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nꞌisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dị ka anyanwụ. Ụkwụ ya na-enwukwa dị ka ọkpụrụkpụ ọkụ.
Igbo 2006
M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nʼeluigwe na-arịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nʼisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dịka anyanwụ. Ụkwụ ya na-acha dịka ogidi na-enwu ọkụ.