Revelation 10:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ otu olu sitere nꞌeluigwe gwa m okwu ọzọ sị, “Gaa napụta mmụọ ozi dị ike ahụ guzo nꞌelu oke osimiri na ala akọrọ akwụkwọ nta ahụ o ji nꞌaka ya.”
Igbo 2006
Olu ahu nke m'nuru ka ọ nēsi n'elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n'aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.”