Revelation 10:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ dị ike, rịọ ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ zara m sị, “Lee ya, were ya taa ya. Mgbe ị na-ata ya nꞌọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dị ka mmanụ aṅụ. Ma mgbe i lodara ya nꞌime afọ gị, ọ ga-elu gị ilu nꞌafọ.”
Igbo 2006
M'we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n'ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’ ”