Revelation 11:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, enyere m ihe ọtụtụ e ji atụ ihe. A gwara m sị m gaa tụọ ụlọ nsọ ukwu Chineke. A gwakwara m sị m tụọ ebe ịchụ aja dị nꞌụlọ nsọ ahụ. A gwakwara m ka m gụọ ọnụ ọgụgụ ndị nile na-akpọ isi ala nye Chineke nꞌime ya.
Igbo 2006
Ewe nyem amì yiri nkpa-n'aka: otù onye we si, Bilie, tù kwa ulo nsọ nke Chineke, na ebe-ichu-àjà-ya, na ndi nākpọ isi ala nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ.