Revelation 11:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụwa nile ga-emekwa ụbọchị e gburu ha ka ọ bụrụ ụbọchị izuike. Ndị ụwa nile ga-aṅụrị ọṅụ nyerịtaa ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nꞌihi ogbugbu e gburu mmadụ abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhuju anya.
Igbo 2006
Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.