Revelation 11:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ otu olu dị ukwuu ga-esi nꞌeluigwe tie mkpu gwa mmadụ abụọ ahụ okwu sị, “Bilienụ, rigota nꞌelu.” A ga-ewelite ha elu na mbara eluigwe baa nꞌime igwe ojii. Ma ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya ka ha na-arigo nꞌeluigwe.
Igbo 2006
Ha we nu oké olu nke si n'elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n'ebe a. Ha we rigo rue n'elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.