Revelation 11:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nꞌotu oge ahụ, nꞌotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu ga-adị, nke ga-eme ka otu akụkụ nꞌime akụkụ iri nke obodo ahụ nile daa. Ndị ga-anwụ nꞌoge ala ọma jijiji a ga-adịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị nile fọdụrụ ga-esite nꞌoke egwu ga-atụ ha nye Chineke nke eluigwe otuto.
Igbo 2006
N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto.