Revelation 11:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe ahụ kwa ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya. Mgbe ọ fụrụ opi ya oke olu dị iche iche sitere nꞌeluigwe na-ada nꞌike nꞌike na-asị, “Alaeze nile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, ya na Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa achị nꞌebe ihe nile e kere eke dị ruo mgbe nile ebighị ebi.”
Igbo 2006
Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”