Revelation 11:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile. Onye na-adị site na mmalite, onye dịkwa ugbu a, nꞌihi na i werela ike nile nꞌaka gị. Ị malitekwala ọchịchị gị.
Igbo 2006
si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n'ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị.