Revelation 11:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụwa nile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na ịkwụghachi ndị na-ejere gị ozi ụgwọ ọrụ ha, bụ ndị nile na-ezisa ozi ọma gị na ndị gị nile, bụ ndị na-atụ egwu gị. Ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nꞌiyi ga-abịakwasịkwa ndị nile e siri nꞌaka ha webata mmebi nꞌebe ihe Chineke kere dị.”
Igbo 2006
Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”