Revelation 11:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa e meghere ụlọ nsọ Chineke nke dị nꞌeluigwe. Ahụkwara m igbe ọgbụgba ndụ Chineke nꞌime ya. Nꞌotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe nke na-ala ihe nꞌiyi bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji dị egwu bidoro nꞌebe dị iche iche, mee ka ụwa nile mee mkpọtụ nke ukwuu.
Igbo 2006
Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.